Jọn Wick bụ otu fịm di kpọ-kpọ gbasara nlọghachi otu nwoke bụvụrụ odogwu n'uwa ndi ogbu-mmadu. Ihe mere o ji lọghachi bụ maka mmegwara ọ chọrọ ime otu oluku a na-akpọ Iosef Tarasov (Alfie Allen). Ọ maka iberibe umu okorobịa na-enweghi isi na ọdụ, ka okpo a ji wee kụwasi mgbupu ụlọ Jọn, ya n'enyi ya wee baa, zuo ụgbọala Jọn, kuwaputakwa ọbara n'ahụ Jọn. Ọ bụrụ na ha kwụsịrị ebe a, onwe ike John agbahara ha, mana ha bịa mezie nke kasi njọ: ha ji otu mgbo gbuo nkịta Jọn.
Chere. Nnyegodi nkịta a, aha ya bụ Daisy, nkeji ekwughi ọkwa.
Daisy bụ onyinye Helen, nwunye Jọn, mere ka o ruo aka Jọn na nsote akwamozu ya. Nkịta a wee bụzie ihe ikpeazu jikọ Jọn na nwunye ya ọhụkasi n'anya. Ọ maka nwaanyị a ka Jọn ji mee ihe ndi mmadụ chee enweghị omume, ka ọ wee pụọ n'ụwa ndi ogbu-mmadu. Oluku a wee were aka gbuo nkịta a k'anwụnta.
Ọ bụrụ na m bụ onye di mkpa n'ụwa a, a ka m isi ka onye ọ bụla n'ụwa jee kirie Jọn Wick (Ndi karịsịa bụ ndị na-agụ Antoropolọgi, Saikọlọgi, Filọsọfi). Ọ bụghị maka na m che na akụkọ, ọgụ, n'ofudu ihe ndị ọzọ na-enye mmadu obi ụtọ dị; ọ maka na Jọn Wick wee ihe atọ ọ chọrọ ikuzie anyị.
Ị na-ege nti ugbua? K'anyị gawazienu ihu. Meeheetụ uche gị obere o?
1) Sọ Otu Mkpebi ka Ndu A Na-Enye Anyị:
Anyị nille bụ anụmanụ. Gị, mụ na Chandi--nkịta na-agba egwu. Onwe ihe anyị weekọrọ ọnụ, ụmụ osisi enweghị, Anyị wee sensi ịse; nke na-eme k'anyị bịe ndụ dị 'sensitif': nke a pụtara n'otu anyị si anabata 'stimuli' wee ike inyere anyi aka ibi ofụma, maọbu ime ndụ anyị ihe ọjọọ. Mana gị na mụ nwekwa ihe abụọ Chandi enweghị: amamihe na uche; nke a pụtara n'anyị na-ebi ndụ amamihe maka n'anyi nwere ike iche ihe, ma ghọtakwa n'ihe ọ bụla anyị echego.
Ka m jutugodi gi ajụjụ: ịma ihe n'eme onye ogu-ike mara ahụ, ka ọ mara ya ahụ? Sọ otu Mkpebi, ibi ndụ mmetụta-obi karị amamihe.
Gulder a na-agụ gi ugbua? Ngwanu nwụtụ obere. Okwa ọ tọrọ ezigbo ụtọ? Nwujuo afọ. Onwe ike Gulder a ga-atọgbọ gi ụtọ ruo mgbe i ga na-achọzi ịnwu Gulder n'ututu, n'ehihie, n'ụlọ ọrụ, n'ahia, mana onwe ihe mere? Ọ bụrụ n'ichọ Gulder, nwuọnụ ya! Onwe onye jị gi?
Ihe mere bụ n'inweghizi ezi uche. Gulder na-achizi gi maka mmasi gi n'ebe ọ nọ; Giwa n'onye gi makwa n'ikwesiri na-anwụ mmanya n'ụlọ ọrụ, mana i ka na-anwụkwa ya. I gbaa nkịtị soro ụzọ a, Ị ga-achọputa n'otu ijiji na-eso ogiri, ka ịga na-esozi mmanya. Ịga na-ebizi ka anụmanụ.
Ama m n'ugbua i na-eche 'kedu ka nwa a sị wee fuu ihe niile a na fiim gbasara onye ji mkpịsị odide wee gbuo mmadụ atọ?'
Biatụ nso k'inwete ihe nille m na-akpọ.
Mgbe Oluku a anyi na-akọ maka ya rutere ụlọ, nna ya ji ezigbo ọkpọ kele ya (Ọtọ karịsịa m ụtọ ). Nna ya, Viggo Tarasov (Micheal Nyqvist) ji ekwenti wee kpọọ Jọn. Leekwa ihe niile ha kwuru:
Viggo: Hello, Jọn. Anụrụm maka nwunye gi...ndo. Ọ di ka, uh, chi m, maọbu akara aka bụ ihe mere k'uzọ mụ na gi zuko ọzọ.
Jọn: (gbachi nkiti)
Viggo: Ekweghị k'anyị gbada jie 'base instincts' mee ihe a. K'anyị zaa okwu a ka ndị mepere anya, dị 'civilised', wee ga n'ihu...(Jọn wee gbanyuọ ọkpụkpọ)
Mgbe Iosef jụrụ nna ya ihe Jọn kwuru, Ọ zara ya si 'Ihe zuru oke'
Ihe e gosiri tupu e ruo mkparita uka Jọn na Viggo bụ, ka Jọn siri kụkasịa ala 'basement' ya, weputa ọtụtụ ihe mgwo agha kwesiri odugwu maka igbu mmadụ.
I ghọta ihe m na-akọ kita? Ngwa, ka m nyere gi aka obere.
Jọn ji nnukwu amamiihe na ike ka ọ wee pụọ na nkwu ndi ogbu, wee bizie n'udo ya na nwunye ya. Ugbua, ihe niile omere, mmadụ niile ogburu alago n'ihi. Maka 'base instincts' ahụ anyị kọ maka ya biazie chịe amamihe. Jọn nke bu mmadụ wee laa. Baba Yaga, odogwu ndi ogbu, wee pụta. Sọ otu oke, k'oji tufuo ihe niile.
Otu oke. Onweghi onye si na o ga adị mfe. Naani otu oke. Jọn kwerenkwa na ọ ga egburiri oluku ahụ, ọ bụrụgodu na ọ ga egbu mmadu narị tupu ọ ruo Iosef--o ruru narị n'eziokwu.
Enyị m, kedu nke i ga-ahọrọ: i ga-ekwe ka mmetuta-obi chie gi, ma ọ bụ amamihe ka i ga-ekwe?
Gụọ ya na Bekee ma ọ bụ French
Iyare Esohe Ewaenosa
Comments
Post a Comment