Akwụkwọ na-atọ ụtọ, mana ihe na-anaghi atọ ụtọ bụ mgbe onye-nkuzi gi nyere gi otu ọrụ ga-eme k'ujọ siri ike baa gi n'ahụ.
'Seenụ photo ugbua wee tinyezie ya na blọgu gi' Onye nkuzi m kwuru 'echekwana na-agaghim eje wee hu ya'
Ọ fọrọ obere ka m tie "OTU AHU?!!!"
Ọ bụrụ n'achọrọm igosi uwa nile ihu m, ọ bụghi nke a pimpulu juru na ya kam ga-egosi. Ejigom ezigbo ego jee studio see photo, nwoke a na-asi m tinye ihu m a danfo ndi lagos emego ka-ọdi k'ihe m amaghi, na blog.
Onwe ike na nkpọtu a m na-eme kari ihe mere (mana onwekwara ike n'ọ kaghi ya). Nke a bu ótụ mgbe m na-ahụ n'onwe m ụjọ ahụ m na-afụwa na ndi enyi m, kasi atọ m ọchị; ụjọ 'ejina filter'.
Nke na-eme m bụ n'otebeghi aka m gbakọọ ndi mmadụ ka ha gee Nicole Chikwe ntị, ka ọ kọwara ha maka ọkọlọtọ mma iberibe, umu nwaanyi na-egbu onye ha ka ha ruo.
M chere na m erula ebe onweghizi ihe obula di njọ m fuuru n'ahu m. Mana ugbua m cheegharizi ya, onwe onye ọ bụla n'uwa huru ahu ya n'anya ruo ebe onweghizi ihe ọ bụla ọ ga-asi n'ọchọghi, kọ na ọ chọrọ iwepụ? Otu ihe ha chọghi ga diriri: ukwu na-enweghi anụ ahụ, imi ntakiri, n'ọtụtụ ihe ndi ozo sọ anya ha na-ahu. Ihe mere bụ na ihe ndi mmadụ na-akpọ 'flawless' agaghi adinwu n'onyeọbụla.
Mana kedụ ihe i che?
(Bekee, French)
Iyare Esohe Ewaenosa
Leekwa ya ebe a |
Comments
Post a Comment